Job 25

Okwu Bildad

1Mgbe ahụ, Bildad onye Shua zara sị:

2“Ike ọchịchị na oke egwu bụ nke Chineke;
Ọ bụ ya na-eme ka udo dịrị nʼeluigwe.
3Onye pụrụ ịgụta usuu ndị agha ya ọnụ?
Onye kwa ka ìhè ya na-adịghị enwukwasị?
4Mmadụ ọ ga-esi aṅaa bụrụ onye ezi omume nʼihu Chineke?
Mmadụ nwanyị mụrụ ọ ga-esi aṅaa dị ọcha?
5Lee, ọ bụladị ọnwa adịghị achawapụta,
ọzọ kpakpando adịghị ọcha nʼanya ya,
6ka ọfọdụzie nwa mmadụ efu mụrụ, nke bụ naanị ikpuru,
mmadụ, nke bụ naanị idide.”
Copyright information for IboBIU